United Kingdom

  1. By Sandrine Lungumbu

    BBC World Service

    A photo of Vanessa Centeno

    Ihe karịrị ụmụnwaanyị otu narị nde na iri ise na-aṅụ mkpụrụọgwụ iji gbochie ịtụrụ ime, ya bụ ọgwụ na-arụ ọrụ nke ọma mana oge ụfọdụ o na-akpata ọnọdụ nwere ike idula mmadụ mmụọ

    Gụkwuo
    next
  2. Mba Briten ga-abanye 'lockdown' ọzọ n'ụbọchị Tọzde - Johnson

    Boris Johnson

    Boris Johnson bụ praịm minista mba Briten ekwuola na ha ga-abanye mmechi obodo ọzọ bido n'ụbọchị Tọzde bụ ụbọchị ise nke ọnwa Nọvemba.

    O kwuru nke a n'ihi na ọrịa coronavirus anyụwakwala ha anya ebe ọ dị ọjọọ ọzọ n'Ịngland.

    O kwuru sị na "ugbua bụ oge ịkpa ike n'ihi na enweghizi ihe ọzọ anyị ga-eme."

    Johnson kwuru na ndị mmadụ ejila ọsọ gbapụ gaa na-abụ nri ha ga-azụkọ, n'ihi na ụlọahịa ebe a na-ere ihe ndị dị mkpa agaghị emechi.

    O kwukwara na ụlọọrụ ebe ndị mmadụ enweghi ike isi n'ụlọ na-arụ ọrụ agaghị emechikwa.

    Site n'ihe o kwuru, ndị mmadụ ga-esinwu n'ụlọ pụọ maka ihe gụnyere:

    • Ịga akwụkwọ
    • Ịga ọrụ ma ọ bụru na ị gaghị anọnwu n'ụlọ rụọ ọrụ
    • Ịga gbatịa ahụ
    • Ịga ụlọọgwụ
    • Ịga zụọ ihe oriri nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa
    • Ilekọta ndị ọzọ chọrọ nlekọta

    O kwuru na mmechi obodo a ga-adịgịde ruo ụbọchị abụọ nke ọnwa Disemba, mgbe ha ga-amalitekwa imepe obere obere site na mpụtara ha ga na-ahụ na mpaghara dị iche iche.

  3. Aka akparala ndị Naịjiria zoro n'ụgbọmmiri na mba Briten

    Ụgbọmmiri tanka

    Ndị agha batara n'ụgbọmmiri e ji ebu mmanụ a na-enyo na ndị omekome jichiri, nwụchiri mmadụ asaa n'ebe a kpọrọ Isle of Wight na mba Briten, n'abalị Sọnde.

    E nyefere mmadụ asaa ahụ e che na ha bụ ndị Naịjirịa na-achọ ikike a na-enye ndị gbara ọsọ ndụ, n'aka ndị uweojii Hampshire.

    E nweghi ihe mere mmadụ 22 na-arụ na ya, dịka ụgbọmmiri ahụ mechara kwụsị njem na Southampton.

    Ndị nwe ụgbọmmiri ahụ bụ Navios Tanker Management, kwuru na ụjọ tụwara onye na-achịkọta ụgbọmmiri ahụ ka ọ hụrụ etu ndị ahụ si na Legọs zobata n'ụgbọmmiri ahụ si na-enye nsogbu.

    Nave Andromeda
    Image caption: A wakporo ebe ahụ n'abalị, n'ihe na-akarịghị nkeji itoolu
  4. Mmachi njem Amerịka na Briten machiri ụfọdụ ndị Naijirịa jọgburu onwe ya - Gọọmentị Naijirịa

    Akwụkwọ njem

    Gọọmentị Naijirịa ekwuola na mmachị ịbata mba ha gọọmentị Amerịka na nkje mba Briten machịrị ụfọdụ ndị Naijirịa maka ebubo nrụrụaka na ntụliaka nke Edo na Ondo steeti jọgburu onwe ya.

    Ọ bụ Ferdinand Nwonye bụ onye na-ekwuchitere minista na ahụ maka mmekọ Naijirịa na mba ndị ọzọ na-akọwa na mmachi a gosiri na Amerịka enweghị nsọpụrụ ebe Naijirịa nọ.

    Ha kwuru na Amerịka na Briten kwesiri ịkwanyere Naijirịa ugwu dịka mba nọrọ onwe ya ma nwee ikike ikpe ndị mba ya ikpe ziri ezi.

    Gọọmentị Naijirịa gara n'ihu kwuo na ha dị njikere ịhụ na ntụliaka nke Edo na Ondo steeti gara nke ọma.