Akụkọ kwuru na agbara ụlọ ruru 125 ọkụ ebe Gọvanọ steeti ahụ na-aba mba gbasara esemokwu ahụ.
GụkwuoNchekwa ndị ụwe ojii
Video content
Video caption: Eastern Security Network: Amaghị m maka ha mana ihe emeziri nke ọma dị mma - John Okiyi John Okiyi bụ kọmishọna mgbasaozi n'Abia Steetị mgbe ọ na-akọwa ọnọdụ nchekwa na steetị ahụ sị na ọ maghị maka Eastern Security Network nke Ipob hiwere.
Video content
Video caption: Orlu Crisis: Akụnaụba obodo a adaala kemgbe ihe mere n'Orlu - Eze Amaifeke Eze Amaifeke dị n'Orlu agwala BBC Igbo uche ya gbasara ọnọdụ obodo ahụ nọ na ya kemgbe ọsọ gbachara ebe ahụ.
Ọ bụghị eziokwu na a na-achụpụ ndị ọchịehi n'Ebonyi steeti - Uweojii
Copyright: Getty ImagesLoveth Odah bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n’Ebonyi steeti ekwuola na anaghị awakpo maọbụ achụpụ ndị ọchịehi na steeti ahụ.
O kwuru nke a iji saa ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-akọwa na a na-achụpụ ndị ọchịehi, ma kwuo na ndị nnọchiteanya ndị ọchịehi bịara njem nleta na nke gọvanọ steeti ahụ bụ Dave Umahi, na mbido afọ ọhụrụ a.
Odah kwuru na ọ bụ ndị omekome rụgharịrị otu ihe onyonyo wee sị na ọ bụ ihe mere n'Ebonyi, tupu ha efesaa ya, na ya bụ ihe onyonyo abụghị eziokwu.
O kwuru na n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Jenụwarị ka otu nwoke bụ Alhaji Adamu bi n'obodo Ozibo dị na Nkaleke Ichaba/Enyibishiri na steeti ahụ, kpebiri na ịkpọla ezinaụlọ ya Taraba steeti bụ ebe o si, ebe ọ kwuru ka ọ gaa chọọ ma ehi ya aga ahụ ahịhịa ndụ, dịka ọkọchị maliterela.
Odah kwukwara na Adamu gwara onyeisi obodo Ozibo tupu o jiri aka ya kwakọrọ ụfọdụ ezinaụlọ ya; o kwukwara na Adamu hapụrụ ndị ezinaụlọ ya mmadụ asaa nakwa ụfọdụ ehi ya n'obodo Ozibo.
Odah kwuru na kọmishọna uweojii steeti ahụ bụ Philip Sule Maku enyela iwu ka e mee nnyocha ịmata ndị mepụtara ihe onyonyo a.
Video content
Video caption: Operation Delta Hawk: Etu ha ji gbagbuo nwunye m n'ọdọahịa ya dị na Delta Steetị. Otu nwoke a kpọrọ Anayo akọwaala etu ndị ọrụ nchekwa a kpọrọ 'Operation Delta Hawk' si gbagbuo nwunye ya n'ọdọahịa ya dị na Delta Steetị.