Ebonyi Steeti

  1. Video content

    Video caption: EBSU: Ihe kpatara ngagharịiwe na Mahadum Ebonyi State University

    Akụkọ fesara na otu onye nwụrụ na ngagharịiwe ụmụakwụkwọ Mahadum Ebonyi State University mere n'ụbọchị Tọzde, mana akụkọ ndị ahụ bụ ụgha.

  2. Video content

    Video caption: Ban on open grazing: 'Anyị ka na-ahụ ndị ọchị ehi na-agbanyeghi mmachi e tinyere'

    Ndị bi na mpaghara Ọwụwa Anyanwụ ekwuola na ha ka na-ahụ ka ndị ọchị ehi na-achị ehi agagharị na-agbanyeghi iwu mmachi gọọmentị tinyere na mpaghara ahụ.

  3. Gọvanọ Ebonyi steeti amachiela ụlọ oringo niile

    Gọvanọ Ebonyi steeti bụ Dave Umahi amachiela ụlọ oringo niile nakwa ọgbakọ ọha niile na steeti ahụ maka igbochi ọrịa coronavirus.

    Ọ gakwara n’ihu kwuo na ụlọụka niile ga na-eme nzukọ naanị awa abụọ tupu ha agbasaa ụbọchị ụka ọbụla n’ihi otu ihe ahụ.

    Umahi mere ka ndị mmadụ mata nke a dịka ọ na-ebido usoro ihe gbasara mfesagharị ọrịa covid-19 nke ugboro abụọ ga-esi aga na steeti ahụ.

    O kwukwara na ha na-atụ anya ịmalite na-arụpụta 'oxygen' na steeti ahụ, iji belatatu ego eji ebuso ọrịa coronavirus agha na steeti ahụ.

    Umahi kwuru na gọọmentị na-anwa ike ha ịhụ na ha welitere aka n'ime nnyocha maka ya bụ ọrịa ozuruụwaọnụ na steeti ahụ.

  4. Okezie Ikpeazu, Willie Obiano, Hope Uzodimma

    Ọrịa coronavirus amalitekwala ifesa ọzọ na Naịjirịa, nke ndị ọkacha mara kpọrọ 'Coronavirus second wave', mana gịnị ka gọọmentị steeti dị icheiche na-eme iji gbochie nke a?

    Gụkwuo
    next
  5. Ọ bụghị eziokwu na a na-achụpụ ndị ọchịehi n'Ebonyi steeti - Uweojii

    Onye ọchịehi

    Loveth Odah bụ ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n’Ebonyi steeti ekwuola na anaghị awakpo maọbụ achụpụ ndị ọchịehi na steeti ahụ.

    O kwuru nke a iji saa ihe onyonyo na-efegharị na soshal midia na-akọwa na a na-achụpụ ndị ọchịehi, ma kwuo na ndị nnọchiteanya ndị ọchịehi bịara njem nleta na nke gọvanọ steeti ahụ bụ Dave Umahi, na mbido afọ ọhụrụ a.

    Odah kwuru na ọ bụ ndị omekome rụgharịrị otu ihe onyonyo wee sị na ọ bụ ihe mere n'Ebonyi, tupu ha efesaa ya, na ya bụ ihe onyonyo abụghị eziokwu.

    O kwuru na n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Jenụwarị ka otu nwoke bụ Alhaji Adamu bi n'obodo Ozibo dị na Nkaleke Ichaba/Enyibishiri na steeti ahụ, kpebiri na ịkpọla ezinaụlọ ya Taraba steeti bụ ebe o si, ebe ọ kwuru ka ọ gaa chọọ ma ehi ya aga ahụ ahịhịa ndụ, dịka ọkọchị maliterela.

    Odah kwukwara na Adamu gwara onyeisi obodo Ozibo tupu o jiri aka ya kwakọrọ ụfọdụ ezinaụlọ ya; o kwukwara na Adamu hapụrụ ndị ezinaụlọ ya mmadụ asaa nakwa ụfọdụ ehi ya n'obodo Ozibo.

    Odah kwuru na kọmishọna uweojii steeti ahụ bụ Philip Sule Maku enyela iwu ka e mee nnyocha ịmata ndị mepụtara ihe onyonyo a.