Coronavirus

  1. Naijiria ga-agbazite ego dị nde dọla 750 n'aka 'World Bank'

    Gọọmenti Etiti na-achọ ịgbazitere ego dị nde dọla narị iri asaa na iri ise n'aka ụlọakụ mbaụwa Bekee kpọrọ 'World Bank'.

    Mịnịsta na-ahụ maka ego na Bọjeti bụ Zainab Ahmed bụ onye gbara ama ụbọchị Fraide n'Abuja n'emume nhibe kọmịtị na-agba mbọ maka gbapụta na nsogbu Covid-19 dọbara akụnaụba Naijiria.

    Ahmed kwuru na ego mgbazite ahụ bụ iji kwalite akụnaụba Naijiria nke Covid-19 kụpịara.

    “Niajiria dịka omba kachasị n'Afrịka agaghị arịanwụ ịtọ n'ọtanisi; ịzọta ndụ mmadụ dị nde narị abụọ bụ mgbado ụkwụ ihe anyị na-ekwu."

    Zainab Ahmed
  2. Mba Briten ga-abanye 'lockdown' ọzọ n'ụbọchị Tọzde - Johnson

    Boris Johnson

    Boris Johnson bụ praịm minista mba Briten ekwuola na ha ga-abanye mmechi obodo ọzọ bido n'ụbọchị Tọzde bụ ụbọchị ise nke ọnwa Nọvemba.

    O kwuru nke a n'ihi na ọrịa coronavirus anyụwakwala ha anya ebe ọ dị ọjọọ ọzọ n'Ịngland.

    O kwuru sị na "ugbua bụ oge ịkpa ike n'ihi na enweghizi ihe ọzọ anyị ga-eme."

    Johnson kwuru na ndị mmadụ ejila ọsọ gbapụ gaa na-abụ nri ha ga-azụkọ, n'ihi na ụlọahịa ebe a na-ere ihe ndị dị mkpa agaghị emechi.

    O kwukwara na ụlọọrụ ebe ndị mmadụ enweghi ike isi n'ụlọ na-arụ ọrụ agaghị emechikwa.

    Site n'ihe o kwuru, ndị mmadụ ga-esinwu n'ụlọ pụọ maka ihe gụnyere:

    • Ịga akwụkwọ
    • Ịga ọrụ ma ọ bụru na ị gaghị anọnwu n'ụlọ rụọ ọrụ
    • Ịga gbatịa ahụ
    • Ịga ụlọọgwụ
    • Ịga zụọ ihe oriri nakwa ihe ndị ọzọ dị mkpa
    • Ilekọta ndị ọzọ chọrọ nlekọta

    O kwuru na mmechi obodo a ga-adịgịde ruo ụbọchị abụọ nke ọnwa Disemba, mgbe ha ga-amalitekwa imepe obere obere site na mpụtara ha ga na-ahụ na mpaghara dị iche iche.

  3. Akụnaụba Naịjirịa agaghị ebunwu coronavirus ma ọ kpawa ike ebe a ọzọ - Buhari

    Onyeisiala Naịjiria bụ Muhammadu Buhari adọọla ndị mmadụ aka na ntị sị ka ha gbaa mbọ hụ na ọrịa ozuruụwaọnụ bụ Covid-19 amalitekwaghị ịkpa ike ọzọ na Naịjiria.

    N'ozi o zipuru na Twitter, o kwuru na akụnaụba mba Naịjiria a akachabeghi aka ibunwu mmechi obodo ọzọ ma ọ bụrụ na ọrịa a malite inye nsogbu ọzọ etu o si na mba dị iche iche ugbua.

    View more on twitter
  4. Gere akụkọ gbasara coronavirus n'Afrịka n'otu nkeji

    Video content

    This content only works in the UK.

  5. Ọnụọgụgụ ndị a na-ahụ coronavirus n'ahụ ha kwa ụbọchị n'Amerịka arịgoola karịa etu ọ na-eru mbụ

    Onye na-enyocha ọrịa

    Coronavirus agwọọla mba Amerịka oke ara, dịka a chọtara ya n'ahụ mmadụ puku iri asatọ na atọ na ụma n'ụbọchị Fraịde, nke bụ mbụ a na-achọta ya n'ahụ mmadụ ole a n'otu ụbọchị.

    Dkt Jerome Adam bụ ọwa ahụ gburugburu nke mba ahụ kwuru na ọ bụ eziokwu na ọnụọgụgụ ndị bu ya na-arị elu, mana ọnụọgụgụ ndị ọrịa a na-egbu kwa ụbọchị adaala n'ihi ụdịrị ọgwụgwụ a na-enye ha.

  6. A nwụchiela mmadụ 25 maka igosi asambodo covid-19 adịgboroja

    Nnyocha Covid-19

    N’afrịka, ndị uweojii mba Uganda anwụchiela ndị njem iri abụọ na ise a na-enyo maka igosi asambodo nnyocha covid-19 adịgboroja.

    E jidere iri abụọ na atọ n’ime ha ka ha na-akwado ime njem n’ọdọụgbọelu Entebbe dị nso isiobodo Kampala, ebe a nwụchiri abụọ ndị ka batara abata.

    Mara na mba Uganda ka mepere okeala ha na mba ndị ọzọ n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Ọktoba, ka ọnwa isii ha ji buso mfesa ọrịa coronavirus agha gachara.

    Ugbua, ha na-ana ndị njem akwụkwọ gosiri na ha ebughi ọrịa covid-19, site na nnyocha e mere na-akarịghị ụbọchị ise tupu onye ahụ emee njem.

    Ndị njem na-abata n'ime mba ahụ kwesịkwara iweta akwụkwọ gosiri na ha ebughi ya bụ ọrịa n'ime ụbọchị atọ tupu ha abanye ụgbọelu ga-ebulata ha.

    Ka ọ dị ugbua, mmadụ 10,590 ebutela ọrịa coronavirus na mba ahụ, ebe mmadụ 97 nwụrụla n'ime ha.

  7. Gere akụkọ gbasara coronavirus n'otu nkeji

    Video content

    This content only works in the UK.

  8. Gere akụkọ gbasara coronavirus n'Afrịka n'otu nkeji

    Video content

    This content only works in the UK.